IKWETA NA MMADỤ NWERE IKE IZURU AKARA AKA GỊ BỤ NKỌGHERI – UTI NWACHUKWU


Uti Nwachukwu, nwa-afọ na-emebe ihe nkiri ekwuola na ndị Naịjiriya ndị kwetara na mmadụ nwere ike izuru akara aka ha bụ ndị nkọgheri.
Uti kwuru nkea n’ọba ozi mmekọrịta Twitter.
O dere sị, “A ka m na-eche banyere etu ọtụtụ ndị Naịjiriya si kwere ka a ghọgbuo ha na mmadụ Chineke kere eke nwere ike izuru akara aka ha k a ọ bụrụzịa nke ha. Amaghị ihe ajọka. Onye mere anyị ihe a?”
Ihe butere okwu ahụ bụ na akụkọ na-ewu ebe nile na Naịjiriya taa, ọ kacha n’Ala-Igbo bụ ndị na-akọ na mmadụ ibe ha nara ha akara aka ha.
Ndị ụkọchukwu ụka akụrụmaka (Pentecostal) meziri ka ọ kazịa njọ site na ịgwa gị na ọ bụ nwanne gị nwoke, nwanne gị nwanyị ma ọ bụ nwanne nna gị bụ onye mere i jighi enwe agamnihu.
Nkea ebutela ọgbaghara n’ime ọtụtụ ezinụlọ. Ndigbo, e mere anyị ihe a eme?