AKỤKỌ ỤWAUncategorized

IKWUTỌ MOHAMMED: A KPỌWO NWATA AKWỤKWỌ NWANYỊ ỌKỤ NA NDỤ NA SOKOTO

Sokoto: Ìgwè mmadụ iwe juru obi akpọwo ótù nwata akwụkwọ nwanyị ọkụ na ndụ maka ikwutọ Onye amụma Mohammed na Koleji ndị Nkuzi nke Shehu Shagari dị na Sokoto, Sokoto Steeti n’ụtụtụ taa bụ Tọzdee.

N’onyonyoo nke wusaworo n’ọba mmekọrịta dị iche iche, e gosiri ebe ụmụ akwụkwọ ụmụ nwoke na-eto ya ihe na-atụkwa ya okwute.

Oge ọ tụ̀bọ̀rọ̀ wee daa n’ala, ha were tyre tụkwasị ya, were kpọọ ya ọkụ na ndụ.

Ótù onye hụrụ ihe merenụ kwuru na ndị omekome ahụ wakporo ya na mkpúrù, gaa dọkpụpụta ya n’ike, gbuo ya.

N’ihi ya bụ mkpa mkpa kpara n’ụlọ akwụkwọ ahụ dị elu, ndị nlekọta ụlọ akwụkwọ nyere ntụziaka ka e mechie ya bụ ụlọ akwụkwọ ozigbo.

Kaọdịtaa, a matabeghi aha ya bụ nwata akwụkwọ nwanyị, onye laworo mmụọ mana ihe doro anya bụ na ọ bụghị onye Alakụba.

Bikonu, kedu ihe mmadụ ji isi koro n’obodo a? E jighizi ndụ mmadụ kpọrọ ihe chaa chaa

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close