Uncategorized

ỊLỤ ỌTỤTỤ NWANYỊ ATỌGBUO M, AKWỤKWỌ NSỌ KWADOKWARA YA

Ọkaibe omebeihenkiri Nollywood, Yul Edochie ekwuwo hoo!haa! na ịlụ ọtụtụ nwanyị atọgbuwo ya.

Nwaamadị a kwuru na ya enweghị mwute ọbụla ịlụ nwanyị nke abụọ.

O mere ihe tụrụ mmadụ niile n’anya n’ime afọ a, oge ọ lụrụ Judy Austin, onye ha abụọ rụkọworo ọrụ imebeihenkiri ọtụtụ oge dịka nwaanyị nke abụọ.

Yul kwukwara na na ya kabụkwa ezigbote “onye nsọ Chineke”, na akwụkwọ kwadoro ịlụ ọtụtụ nwaanyị na Exodus 21:10.

“Ndị na-akatọ m aghọtaghị m chaa chaa. Ọ bụ akara aka m, bụrụkwa ihe Chineke gwara m ka m mee.”

Yul kwuru nke a n’ọbaozi mmekọrịta dị iche iche dika Twitter na Instagram.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close