AKỤKỌ ỤWA

IRE MITA PUKU NAIRA IRI ISE: NYE ANYỊ AHA ONYE ỌRỤ ANYỊ ỌBỤLA AKA YA DỊ YA – EEDC

Enugwu: Ụlọ ọrụ Enugu Electricity Distribution Company (EEDC) ekwuola ọzọ na ha na-ebunye mita n’efu ugbua.

N’ajụjụ ọnụ onye nta akụkọ anyị gbara ya, Ọnụ na-ekwuru ụlọ ọrụ ahụ, Mazi Emeka Eze dọrọ ọhaneze aka na ntị, ka ha ghara inye onye ọbụla ego maka ibunye ha mita, na mita bụ n’efu.

“EEDC ekwuola ọtụtụ oge na anaghị akwụ ụgwọ ọbụla maka ibute mita. Onye ọbụla nyeziri mmadụ ego maka mita, aka anyị adịghị ya.

“Ọtụtụ ndị a na-anapụ ndị mmadụ ego abụghị ndị ọrụ anyị. Kaosiladi, o nwere onye ọrụ EEDC ọbụla nara mmadụ ego maka mita, onye ahụ wetara anyị mkpesa, ma ọ bụrụ na ọ dị njikere ịgba akaebe n’okwu ahụ”

E nweela mkpesa n’aka ọtụtụ mmadụ, na ndị ọrụ EEDC na – ana ndị mmadụ ego iji bunye ha mita n’agbanyeghị na Gọọmenti Etiti ekwuwo hoo!haa! na mita bụ n’efu.

Iji maa atụ, na Mpaghara New Haven, ndi ọrụ EEDC na – ana ndị nwere ụlọ ọrụ Puku Naira iri ise, na-anakwa Puku Naira iri abụọ maka ụlọ obibi.

Kaosiladi, o nweghị onye n’ime ndị a naara ego maka mita dị njikere ịbịa nye ndị EEDC mkpesa ma ọ bụ gbaa akaebe iji hụ na aka kpaara ndị ọrụ EEDC ahụ na-emebi aha ụlọ ọrụ ahụ.

Ebe a nara ndị mmadụ ego mita na New Haven gụnyere Okporo ụzọ Marcus Garvey nakwa n’ogologo Okporo ụzọ Chime.

Ótù nwanyị, Nkechi, onye nwere ụlọ ọrụ, n’ogologo Okporo ụzọ Chime, onye ndị EEDC nara puku Naira iri ise iji tinyere mita ọhụrụ jụrụ ịbịa nye mkpesa maka ego a nara ya.

Ọ sịrị: “Ihe ka m mkpa bụ na a gaghịkwa ewetara m ego mmagbunye (estimated bill) dịka ụgwọ ọkụ ọzọ”

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close