Uncategorized

IRI NGARI: ỤLỌIKPE MKPEDEBE ÁKWÀDOWO NGA AFỌ ISE A TỤRỤ RT HON FAROUK LAWAN

Abụja- Ụlọikpe Mkpedebe Naịjiriya akwadowo nga afọ ise nke Ụlọikpe Mkpegharị tụrụ Rt Hon Farouk Lawan, onye nọbu n’Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Nta Naijiriya maka iri ngari.

Na mkpebi n’enweghị mgbagha ọbụla, ndị ọkaikpe ise lebara anya n’okwu ahụ kwadoro nga afọ ise nke Ụlọikpe Abụja tụrụ ya nke Ụlọikpe Mkpegharị kwadokwara.

A tụrụ ya nga n’afọ 2021 maka ịnara $500 dika aka azụ n’aka Femi Otedola, ójìegoachụego, onye bụ Onyeisi Oche, Ụlọ ọrụ Zenon Petroleum and Gas Ltd.

Na mkpebi ahụ nke Ọkaikpe Tijjani Abubakar gụpụtara, Ụlọikpe Mkpedebe kpebiri na mkpesa ahụ ọ wetara ha erijughi afọ chaa chaa.

Chai! Farouk Lawan! Odogwu nwoke! Ọdị nkenke eme ire! Odogwu na-epe mpe! Ụbọchị bụrụ gbóó, dike okwu ya na-ada ụda n’ụlọ nzukọ Omebeiwu Naijiriya. Ọ bụ ka I siri jee? Kedu ka I siri maa n’ọ́nyà? Ọ dịkwa mma ka e jiri gị maa atụ.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close