AKỤKỌ ỤWA
ỊRỤ OKPORO ỤGBỌ OLOKO GAA MBA NIJÉÉ KWESỊRỊ INYO ENYO- GỌVANỌ ORTOM


Makurdi : Gọvanọ Samụwelụ Ortom nke Benuwe Steeti akatọọla atụmatụ Gọọmenti Etiti ji achọ ịrụ okporo ụgbọ oloko si Kano gaa mba Nijéé dịka imebi ego n’adịghị adị.
N’okwu ya ụnyahụ, na emume ịtọ ntọala ụlọ ọrụ Benue State Geographic Information Service na Makurdi, Ortom jụrụ sị, “Kedụ uru atụmatụ a ga-eri akatamkpo ego dị ótù ijeri dọla na ụma itoolu ($1.9bn)?”
“E kwesịrị inyo ebumnuche Gọọmenti Etiti maka ịrụ okporo ụgbọ oloko ahụ enyo”
Ortom kpọkwara ndị Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Naịjiriya ka ha gbaa mbọ kwụsị Gọọmenti Etiti imefu ego n’atụmatụ ahụ nke ana-enyo ebumnuche ya enyo.