AKỤKỌ ỤWA

IRU UNYI: NWOKE ABỤJA AGBAALA NWUNYE YA AKWỤKWỌ ALỤKWAGHỊM

Abụja – Adeboye Omotayo, onye ọrụ bekee agbawo nwunye ya akwụkwọ alụkwaghịm n’ụlọikpe nọ na Jikwoyi, Abụja maka oke iru unyi.

O kwuru na iru unyi nwunye ya bụ Ella, akarịala ya aka.

“Nsogbu anyị nwere bụ na nwunye m amaghị edebe ụlọ ọcha.

“M si ọrụ bata ka m zuo ike, ebe nile eruo unyi, na-esi ka ebe a na-azụ ezi

“E digidewo m, ike agwuwo maka na ọ maghị ileta onwe ya anya. Oge ọbụla, ọ na-adị nkịrịnka n’anya

Ọmọtayọ kwukwara na nwunye ya enweghịkwa ùgwù, nsọpụrụ ma ọ bụ ịhụnanya ọbụla n’ebe ọ nọ maka na o chere na o mezuwo ihe o jiri bịa bụ ịmụta ụmụaka.

“Ya na ndi be ha jikọkwara aka na akparị ma na eyijakwa ndụ m”

Kaosiladị, nwunye bụ onye ahịa kwuru na eziokwu ọbụla adịghị n’ebubo iru unyi di ya boro ya.

Ọkaikpe Thelma Baba, nyere ha ndụmọdụ ka ha jiri maka ụmụ ha dozie okwu ahụ n’etiti onwe ha.

O higharịzịrị ikpe ahụ n’abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Jenụwarị a.

hmmmm, “ọ̀mà ákwà asa ahụ mara onwe ya”. Nwaanyị a agọwo aka ya na ụkwụ ya na ya anaghị eru unyi ka ezi mana ya gbaa mbọ dozie ndụ ya. Nwoke agaghị ebo nwaanyị ya na ya biworo ọtụtụ afọ udiri ebubo ahụ na nkịtị.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close