Uncategorized
ISI ADỊGHỊ ANDY ỤBA MMA IKWU NA M NA-ACHỌ ỊBA APC – NWUNYE GỌVANỌ OBIANỌ



ỌKA: Osodieme Ebele Obianọ, nwunye Gọvanọ Anambara Steeti ekwuola hoo!haa!! na isi adịghị Sinetọ Andy Uba mma.
Osodieme Obianọ kwuru nke a na nzaghachi ya nye Sinetọ Andy Ụba, onye ji aha òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị All Progressives Congress (APC) were azọ ọkwa Gọvanọ n’Anambara Steeti, onye sịrị na ya bụ nwunye Gọvanọ Obianọ ga-aba òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị APC n’oge n’adịghị anya.
Osodieme sịrị, “Chineke gachaa, onye ọzọ na – esote ya n’ebe m nọ bụ di m, onye mụ na ya maworo ihe karịrị afọ iri atọ n’ise.
“Ikwu na m ga-ahapụ òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị All Progressives Grand Alliance (APGA) baa òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị All Progressives Congress (APC) bụ nke di m nọ na ya pụtara na isi emebiwo Andy Ụba”