ỊSỊ ONYE Ị KPỌRỌ ORIRI KWỤỌ ỤGWỌ IHE O RIRI BỤ IÑOMI NZUZI NDỊ ỌCHA – UGEZU J. UGEZU



Ochiedike Nollywood Ugezu J. Ugezu akatọwo ihe na-ewuzi ugbua bụ ịsị ndi mmadụ kwụọ ụgwọ ihe ha riri na mmemme dịka iñomi nzuzu ndị ọcha.
Ọ kọziri banyere enyi ya nwoke gara mmemme na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda, onye a kpọrọ oriri were sị ya kwụọ ụgwọ ihe o riri.
N’okwu ya n’Instagram, Ugezu kwuru na udiri ihe ahụ bụ omenala na mba Amerika mana na ndi Naịjiriya ji nwayọọ na amụtazị ya. O kwuru na e bidoro ọhụrụ na Legọs.
Ugezu, onye malitere itipụta egwu na nke ikpeazụ a kwuru na nke gbakara ya isi bụ akụkọ enyi ya nwoke kọrọ maka agbamakwụkwọ ha gara n’Ọnịcha, ebe a gwara onye ọbụla ka ha kwụọ ego dị n’agbata N10,000 na N5,000.
O kwuru na a naghị ụmụaka ego ọbụla mana a gwara ndi okenye ka ha kwụọ ụgwọ erimeri ha riri.
“Bikonu, onye e jighi ego, ya akpọla oriri. N’Ala-Igbo nakwa be ndi isi ojii, onye ihe ọma meere na-akpọku ọhaneze ka e soro ya tụọ mmamma. Ọ bụghịzị onye richaa, ị saara ya aka. Mbanụ!”
hmmmm, oge ọbụla, ndi be anyị na -eji ọsọ amụta ihe ọjọọ ndi ọcha na-eme ma leghara nke ọma ha na-eme anya.