AKỤKỌ ỤWA
ỊTỤ AKWỤKWỌ: EFCC ANWỤCHIKỌWO ỤMỤ OKOROBỊA ENUGWU IRI ABỤỌ NA ATỌ



Enugwu – Ndi ọrụ kọmishọọnụ na-emegide ngarị, Economic and Financial Crimes Commission, EFCC, mpaghara Enugwu nọrọ ụbọchị Fraidee were nwuchikọọ mmadụ iri abụọ na atọ a na-ebo ebubo ịtụ akwụkwọ.
A nwuchikọrọ ha n’Enugu-Ezike, Nsụka nakwa n’ime obodo Enugwu site na ọgbụgba àmà dị ire banyere mpụ ha na-eme n’ọbaozi (online). E nwetakwara ihe akaebe (evidence) dị iche iche n’aka ha.
Ihe ndi a napụtara ha gụnyere; ụgbọala atọ, ekwentị, laptop, POS machine tinyere ihe ndị ọzọ gosiri na ha bụ “oke tara azụ nọ na ngịga” ka e siri boo ha n’ebubo.
A ga-akpụga ha ụlọikpe ozigbo e mechara nnyocha n’okwu ahụ.