AKỤKỌ ỤWA
IYI UWE AGBAMAKWỤKWỌ “GBA Ọ́TỌ̀” :ADA RIBADU ARỊOWO MGBAGHARA

Abụja: Fatima, Ada Nuhu Ribadu, onye bụbu Onyeisi oche, EFCC) arịọwo mgbaghara maka uwe agbamakwụkwọ na-egosi ime ahụ ya, o yi ụbọchị Satọdee oge ya na nwa onye jibu ọkwa Osote Onyeisiala, Atiku Abubaka gbara akwụkwọ n’Abụja.
Ọtụtụ mmadụ, ọ kacha ndị Alakụba katọrọ udiri uwe agbamakwụkwọ ahụ nke gosiri árá ya nakwa akụkụ ahụ ndị ọzọ o kwesịrị ikpuchi ekpuchi.
N’okwu ya ụbọchị Tuuzdee, Fatima kwuru sị :”E nweghị m ike ighewe ahụ m oyi. Ihe mere bụ na akpụkpọ ahụ na uwe agbamakwụkwọ m na – achakọ òtù ọcha (the same colour)
“Kaosiladi, a na arịọ ndị ezinụlọ m na ndị enyi m mgbaghara”