AKỤKỌ ỤWA

“JIRI NDỤ GỊ MEE IHE BARA URU” GỌVANỌ MATAWALLE NA – AGWA NWOKORỌBỊA JI ỤKWỤ SI KADUNA ABỊA ZAMFARA MAKA YA

Gusau: Gọvanọ Bello Matawalle nke Zamfara Steeti agwala Musa Umar Giwa, onye ji ụkwụ si Kaduna na-aga Zamfara iji gosipụta ịhụnanya o nwere Gọvanọ ahụ ka ọ laghachi azụ ma were ndụ ya mee ihe bara uru.

Giwa nọrọ n’abalị iri abụọ n’isii nke ọnwa Septemba, si n’obodo ya dị n’Okpuru Ọchịchị Giwa nke Kaduna Steeti were zọpụ njem ịga gosi Gọvanọ Matawalle nkwado na Zamfara Steeti.

Matawalle nọrọ na Twitter kwuo sị, “A na-ekele nwa okorobịa ahụ maka igosi m nkwado.

“Kaosiladi, dịka nna, a gaghị m achọ ka onye ntorobịa ọbụla tinye aka na ime ihe ọbụla ga-ebutere ya ọdachi maka ihi m.

“Kama ya were ike nakwa oge ọ ga-etufu na Njem ụkwụ ahụ were baara onwe ya uru”

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close