AKỤKỌ ỤWA

KAMALA HARRIS CHỌRỌ ỊKWATA ỌKWA ONYEISIALA AMERỊKA N’ÍKÓ, UME ADỊGHỊ BIDEN ỊNỌTE AKA – TERENCE

Mazị Terrence K. Williams, onye isi ojii bu nhọpụta Onyeisiala Donald Trump n’isi ekwuola na Kamala Harris, onye bụ Osote Jo Biden chọrọ iji akwamiko rịgooro dịka Onyeisiala mba Amerịka.

Nwaamadị a bụ ọ́kpá ọ̀chị̀ (comedian) kwuru na Twitter na ndụ Harris, onye na-achọ ịbanye n’ọkwa dịka Osote Onyeisiala abụghị ihe ụmụ agbọghọ kwesịrị iṅomi.

O kwuru sị, “Kamala Harris ji akwamiko were rịgoro n’ọkwa ọchịchị. Ugbu a, ọ chọrọ iji Jo were bụrụ Onyeisiala maka na ume adịghị ya (Jo) ịnọte aka n’ọchịchị”

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close