Uncategorized

KEDỤ OTIGBA?

Otigba bụ ótù akpụrụ akpụ so n’ihe ejiri mara Enugwu. Ọ bụghịzị sọọsọ na o so n’ihe e ji mara Enugwu kama ọ bụzị ejirimara Enugwu.

Otigba bụụrụ Enugwu ihe akpụrụ akpụ Nnwere onwe (Statue of Liberty) bụụrụ New York, ma ọ bụkwanụ ihe Ụlọ Nche Eiffel (Tower of Eiffel) bụụrụ Paris.

Ọ di mwute na ndị ntorobịa iwe dị n’obi kụriri akpụrụ akpụ Otigba n’oge ngagharị iwe #ENDSARS.

Nke a mere e ji buru akpụrụ akpụ ahụ e tijasịrị etija were bugara onye mụrụ ya, ka o lezikwaa ya anya, etu nne si elezi nwa ya anya.

Mazi Kris Afụba, ochie dike na ịkpụ akpụrụ akpụ bụ ya bụ ọ̀kpụ́ụ́ kpụrụ Otigba. Ma ndị ngagharị iwe #ENDSARS akụtughi Otigba, ọtụtụ agaghị amata banyere odogwu a bụ Kris Afụba, onye nyere anyị Otigba – Ejirimara Enugwu.

Ya bụ, ụbọchị ọbụla ị hụrụ Otigba ka ọ na-eti ịgba ya na Njekọrịta Ụzọ Otigba (Otigba Junction) weliere ụzụ kpụrụ ya, Kris Afụba aka elu.

Ndị Enugwu, ndị 042, kedu Kris Afụba? Onye hụrụ ya jaa ya mma maka na ọ bụ odogwu. Ka anyị jaa ochie dike a mma na ndụ site na ịkwanyere ya ùgwù ụbọchị ọbụla Gọọmenti Enugwu Steeti ga – ekpughe akpụrụ akpụ Otigba nke e ji ihe kpuchie na Njekọrịta Ụzọ Otigba.

Bikonu, ka ekpughepu akpụrụ akpụ Otigba ka ụwa were jaa ọ̀kpụ́ụ́ Kris Afuba mma, onye nọ ị na “ụwa mgbede” nke ndụ ya, mma na ndụ, etu Maịk Ejeagha siri gụọ n’egwu.

Show More

Related Articles

One Comment

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close