AKỤKỌ ỤWA

KWỤSỊNỤ IJIKỌ AHA IPOB, ESN NA NKE EKPA, EKPERIME FINLAND -IPOB

Òtù Indigenous Peoples of Biafra (IPOB) adọọla Gọọmenti Steeti Enugwu aka na ntị banyere ịkpọ aha òtù ahụ tinyere nke ngalaba nchekwa ha bụ Eastern Security Network (ESN) n’okwu ọbụla banyere Saịmọn Ekpa, onye nke ha kpọrọ “Ekperime Finland”.

N’ozi o zigaara ndi nta akụkọ, Emma Powerful, ọnụ na-ekwuru IPOB gbarụrụ ihu etu Gọọmenti Steeti Enugwu nakwa ndi ọrụ nchekwa ala Naịjiriya si akpọrọ aha IPOB na ESN etinye n’okwu Saịmọn Ekpa bụ “Onyeisi ndi Ekperime nke bi na Finland”.

“Gọọmenti Steeti Enugwu nọrọ na nso a were kwuo na ndi Uweojii ememinawo ndi ntọ ruru mmadụ iri abụọ na itoolu na akụkụ dị iche iche na steeti ahụ, ndi nke bụ ndi ESN nọ n’okpuru Saịmọn Ekpa”

Powerful kọwara okwu ahụ dịka nke eziokwu ọbụla anọghị n’ime ya.

“Nke a bụ okwu asị. Anyị ekwuwo ọtụtụ oge na o nweghị ihe dị ka Autopilot na IPOB ma ọ bụ ESN.

“Saịmọn Ekpa abụghị onye òtù IPOB nke nọ n’okpuru Onye ndu Mazị Nnamdị Kanụ.

“Ndi ọrụ mgbasa Gọọmenti Steeti Enugwu kwesịrị ịkwụsi ịkpọrọ aha òtù IPOB ma ọ bụ ESN tinye n’okwu ọbụla banyere onyeisi ndi ekperime, Saịmọn Ekpa na ndi ekperime na ndị arụrụala ibe ya.

“Ndi ọrụ nchekwa ala Naịjiriya na ngalaba ọchịchị dị iche iche na Naịjiriya kpachara eme nke a iji mebi aha òtù IPOB na nke ESN”.

hmmmmm, Chineke zọpụta ụmụ ya

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close