AKỤKỌ ỤWA

LEE MMỌNWỤ NA – ACHỤ NWANYỊ N’OTIGBA, ENUGWU

Enugwu : N’Otigba, Enugwu, mmọnwụ Ista hụrụ nwa agbọghọ masịrị ya were chefuo na ọ bụ mmọnwu.

Ka egwu, ka egwu, ya bụ mmọnwụ malitere ịchụ ya bụ nwa agbọghọ. Kama ịtụzị ụjọ dịka nwaanyị hụrụ mmọnwụ, ha abụọ kpara nkata na-aga.

Mmọnwụ nara ya bụ “Yellow Sisi” akara ekwentị ya mana o doghi anya ma o nwetara ihe ọ na-achọ. O dugidere ya bụ nwa agbọghọ, duruo ya ebe ọ banyere ụgbọ ala (bus) na – aga New Layout, tupu ọ laghachi azụ.

Hmmm, bikonu, kedu ihe mmadụ agaghị a hụrụ “ụmụ okorobịa” taa? Ị bụrụ mmọnwụ, i mee ka mmọnwụ ka ùgwù gị dịrị gị.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close