LỌLỌ MADỤ JI ỌKPA MEE NCHETA ỌMỤMỤ YA TAA N’ỤLỌ ỤKA



Enugwu : Mmadụ ịgba iri afọ asatọ n’ótù abụghị obere ihe chaa chaa. Ya mere Lọlọ Teriza Madụ jiri kpebie ime Mmemme Ncheta Ọmụmụ nke afọ iri asatọ n’ótù ya taa bụ abalị iri abụọ n’atọ nke ọnwa Septemba n’ụzọ pụrụ iche.
Lọlọ Madụ na ndị ezinụlọ kere ndị nile bịara ụka ụtụtụ n’ụlọ Katọliki Onye Nsọ Mulumba na New Haven, Enugwu ọkpa na mmanya ọtọ bịrịbịrị so ya n’azụ.
Tupu ụka agbasaa, Ụkọchukwu Nikọlaasị Ọnwụzulike kpọlitere Lọlọ Madụ, onye ndị ezinụlọ dị pụtara n’ihu ụlọ ụka ebe ọ nọrọ waa achịcha ncheta ọmụmụ ya.
N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ, Lọlọ Madụ kọwara ihe mere ya ji sie ọkpa butere ndị ụka bụ maka na ọ bụ etu ahụ ka ndị be ha, ndị Ábọ̀ si eme mmemme.
“A bụ m onye Ábọ̀ dị n’Okpuru Ọchịchị Udi. Ọkpa ka ndị be anyị ji eme mmemme ọbụla.
Ọ dụkwara ndị ntorobịa ndụmọdụ ka ha na-erubere nne na nna ha isi iji were bie ogologo ndụ, kaa nka dịka ya onwe ya.
N’okwu nke ya, nwa ya nwoke, Dọkịnta Kenechukwu Madụ kwuru sị,
“Ọ na-amasị Mama ísí ọkpa oge ọbụla ọ na- eme mmemme. Ya mere anyị ji kpebie ísí ọkpa bute ka ndị ụka soro anyị kelee Chineke n’ísì ya”