AKỤKỌ ỤWA

LOTANNA AZỤOKEKE ABỤRỤWO ỌKAIBE N’ULE JAMB AFỌ A SITE NA NDEBE ÀTỤ̀ ÁKÀRÀ 337 YA

Enugwu – Obere Mazị Lotanna Azụokeke, onye Ọ a dị n’Okpuru Ọchịchị Ndịda Idemili n’Anambara Steeti eturuwo ugo dịka ọkaibe n’ule JAMB nke afọ a site na ịnweta akara narị atọ na iri atọ na asaa (337) mere o ji bụrụzịa odebe àtụ̀ (record breaker).

Ya bụ nwata akwụkwọ ụlọ akwụkwọ Bishọọpụ Otubelu, Trans Ekulu, Enugwu gafere àtụ̀ (record) Chidera Obi, nwa-afọ Igbo ọzọ debere afọ ise gara aga site na ịnweta akara narị iri atọ na iri abụọ na itoolu (329).

Lotanna, onye nwere akara iri itoolu na itoolu na Mathematics tinyere akwụkwọ maka ịgụ na Ngalaba Nkanụzụ na-ahụ maka Ọkụ Latriiki na Mahadum Naịjiriya dị na Nsụka.

Lee akara ya bụ obere Mazị dị afọ iri na ise nwegasịrị

English:64
Mathematics: 99
Physics: 86
Chemistry: 88
Nchịkọta :337

Hmmm, Igbo dị egwu site nọ̀gbọ́ ruo nọ̀gbọ́, site na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ. A na -egbu achara, ọ na-etowanye. Okuke Abịama Chi Ndigbo, a gị nwe aka a.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close