Uncategorized

MAZỊ SAMSUNG ANWỤỌLA

Ọnwụ egbuola Mazị Lee Kun-hee, dị afọ iri asaa n’asatọ, Onyeisi ụlọ ọrụ mmepụta ngwa ahịa mba Sawụtụ Koria bụ Samsung.

Mazị Kun-hee, onye nọ n’ụlọ ọgwụ ndị Samsung kemgbe o nwere ọrịa mmapụ obi (heart attack) n’afọ 2014, nwụrụ n’ụtụtụ taa bụ ụka.

Oge nna ya, Lee Byung-chull, onye mhiwe Samsung nwụrụ n’afọ 1987, Lee Kun-hee gbanwere ọnọdụ ụlọ ọrụ mmepụta ngwa ahịa n’ụdị pụrụ iche.

Tupu oge ahụ, a maara Samsung dịka ndị na-arụpụta ngwa ahịa adigboroja, etu e si mara Chaịna taa. Nwoke a gwara ndị ọrụ ya na ya chọrọ ka ha “gbanwee ihe nile ewezuga nwunye ha na ụmụ ha”.

O bu pụtara ekwentị nakwa ngwa ahịa adigboroja nile Samsung mebere ma nọrọ n’ihu ọhaneze kụrisia ma kpọọ ha ọkụ iji gosi mkpebi ya iweta mgbanwe pụrụ iche.

Taa, site na mbọ odogwu nwoke a, Samsung bụzi ụlọ ọrụ mmepụta ngwa ahịa kacha nwee agba na Mbaụwa.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close