AKỤKỌ ỤWA

MBAKWA! ANYỊ ENYOGHI NWANYỊ GBA ỌTỌ N’EBE ANYỊ NỌ ỌRỤ – ÒTÙ NCHEKWA ANAMBARA VIGILANTE GROUP (AVG)

Ọka – Ndị òtù nchekwa Anambara Vigilante Group (AVG) ekwuola hoo!haa! na ndi ọrụ ha enweghị ihe oge ọbụla ha jiri nwanyị gba ọtọ n’ime mkpùrù ya ka ha nọ ọrụ n’Ọ́kpụ́nọ̀ dị n’Ọka.

Nkea bụ maka ebubo ótù nwata nwanyị boro ha, na ya mabatara n’ ime mkpùrù ya ebe ọ gba ọtọ, nyoo ya nke ọma ma burukwa ya buga n’, ụlọ ọrụ ha ebe o jizi Puku Naira Ise (N5000) were gbapụta onwe ya.

N’ozi wusara ebe nile na nso a, ótù nwoke bụ àgbàtàobi nwanyị ahụ kwuru na ndị nche ahụ mere ihe a sị na ha mere. O kwukwara na ha gbálìrì égbè elu, tikaa ihe mgbochi ọnụ ụzọ ya, tie ya ihe ma kpụrụkwa ya kpụga n’ụlọ ọrụ ha, ebe o jikwa N5000 gbapụta onwe ya, n’agbanyeghị na o jighi ụgwọ nche.

Kaosiladị, ọnụ na-ekwuru ndị òtù nchekwa Anambara Steeti ahụ bụ Mazị Nweke Nweke kwuru na ebubo ahụ bụ okpookpo asị.

“Ndị na-ebo ebubo a bụ ndị a chụrụ n’ọrụ n’òtù nchekwa AVG ndị ñụrụ iyi na ha ga-emebi aha ndị AVG kwụrụ ha ụgwọ iji mebie aha AVG na nkịtị.

Na nkọwa nke ya, Nweke kwuru na ha enyoghi nwanyị ahụ ka ọ gba ọtọ kama na ha kpụgara ya n’ụlọ ọrụ ha maka na o ji ụgwọ nche.

“Oge a bịara ịgba ya ụgwọ nche, ọ jụrụ jụwaa isi kama ọ sịrị na ọ bụ ọrụ dịrị Gọọmenti inye ya nchekwa n’efu.”

Nweke kọwara na o nweghị ego ọzọ ha nara nwanyị ahụ karịa Narị Naira Ise (N500) bụ ụgwọ nche ọnwa Ọgọọstụ ọ jụrụ ịkwụ. Site n’okwu ya, ha anaghị onye nke nwoke bu àgbàtàobi ya ego ọzọ ọbụla oge o gosiri ha akwụkwọ o jiri kwụọ ụgwọ.

Hmmm, “eziokwu na akwụ ọtọ” mana , onye ma nke bụ eziokwu ugbu a?

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close