MEFỌ AHAPỤWO IPOB BIDO REDIYO NKE YA BỤ BHFR


Mazị Uche Mefọ, onye bụbu Osote Mazị Nnamdi Kehinde Kanu dịka Onyeisi IPOB apụọla kpam kpam n’òtù ahụ ma bidokwa ụlọ mgbasa ozi Rediyo nke ya bụ “Biafra Human Rights and Freedom Radio (BHFR)“.
Site n’ozi akwụkwọ akụkọ Naịja News wepụtara, nkea bụ maka esemokwu dị n’etiti ndị isi òtù IPOB abụọ ahụ nke n’ekweghị ndozite.
Ihe a sị butere esemokwu ahụ bụ na Mefọ ekwenyeghịzị n’ụzọ aka ike Kanu ji achịkwa òtù ahụ nakwa usoro IPOB ji ahazi ọgụ nnwere onwe Biafra nke ọ sịrị gbadoro ụkwụ n’asị na aghụghọ.
Iji maa atụ, Naịja News kọwara na Kanu n’onwe ya ekwubuwo na mbụ na Mefọ gwara ya ka ọ kwụsị ikwu na ejizi Jubril Al-Sudaini were dochie Onyeisiala Muhammadu Buharị, onye nke ọ sịrị na ọ nwụọlarịị.
Ruo taa, ọtụtụ mmadụ ka kwenyere n’akụkọ Mazị Nnamdi Kanu na onye na-achịzi Naịjiriya bụ Jubril na ọ bụghịkwa Buharị.