AKỤKỌ ỤWA

MKPARỊ NAỊRA: NDI UWE OJII AKPỌỌLA OBI CUBANA ỊGBA YA AJỤJỤ

Ọka: Ndị Uwe Ojii Naịjiriya, Ngalaba Anamabra Steeti akpọọla Ichie Obi Cubana Iyiegbu, onye mere Akwamozu nne ya n’Ọba, Anambara Steeti na ngwụcha izu ụka gara aga n’udi mechiri akwụkwọ, ka ọ bịa zaa ajụjụ banyere ebubo mkparị Naira na ya bụ mmemme.

Ndi Uwe Ojii kpọrọ ya ụbọchị Mọnde ka ọ bịa zara ọnụ ya mana ha ekwughi na ha chọrọ ịkpọchi ya.

Iwu hiwere Ụlọakụ Etiti Naịjiriya nke afọ 2007, nkeji nke iri abụọ n’otu kwuru na onye ọbụla bọ́rọ́ Naira nwere ike ije nga ọnwa isii ma ọ bụ kwụọ nha Puku Naira iri ise ma ọ bụkwanụ o nweta ụzọ ntaramahụhụ abụọ a.

Akụkọ Akwamozu nwaamadị a bụ omereọha, onye ndị be ha chiri echichi dịka Ọkpata ozuo ọra n’Ọba maka etu o siri enyere ndị ntorobịa obodo ahụ aka, bụ nke agaghị akọcha akọcha maka na ya na ndị ótù ya sịrị “ego rie nsị” site na ego sịrị zoo ka mmiri ebe ahụ.

Ka onye nta akụkọ kpọtụrụ Ọnụ na-ekwuru ndị Uwe Ojii na steeti ahụ, Ikenga Tochukwu maka okwu ahụ, o kwuru na ọ ga-azaghachi mana ọ zaghachihi ruo ugbu a.

N’aka nke ọzọ, Wilson Uwujaren, Ọnụ na-ekwuru ụlọ ọrụ EFCC kwuru na ụlọ ọrụ ahụ agaghị ekwu ihe ọ na-akwado ndị ahụ kparịrị Naira na mmemme ahụ.

Kaosiladi, ọtụtụ mmadụ na-ekwu na o nweghị ihe ndị Uwe Ojii pụrụ ime nwaamadị ahụ.

Mazi Dozie Ọnwụbiko nke òtù HURIWA gwara ndị Uwe Ojii na ndị EFCC ka ha hapụ nwoke ndị o mere ọgọ na ndị enyi bịara soro kwaa nne ya, gaa chụwa ndị ji ego ha akwado ndị Boko Haram.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close