AKỤKỌ ỤWAUncategorized
MKPUCHI IHU APỊGBUOLA ONYE NCHE KPU YA LABAA ỤRA

Abiokuta: Ótù onye nche, Solomon Ede nọrọ n’izu ụka gara aga nwụọ n’ógbè Alako n’Abiokuta, Ogun Steeti oge ume sọrọ ya maka mkpuchi ihu ọrịa koro o yi labaa ụra n’ebe ọ na – eche nche.
Ya bụ nwamadị bụ onye Ugwuajị, Ọkụnanọ n’Enugwu Steeti bụ onye a maara dịka onye na-eyi mkpuchi ihu oge nile iji gbalahụ ibute ọrịa koro.
Kaosiladi, n’abalị ụbọchị, Mazị Ede, onye e ji ịṅụ kai kai mara ṅụfere mmanya ọkụ ókè maka na obi adịghị ya mma. O chefuziri iyipu mkpuchi ihu ahụ tupu ọ labaa ụra.
Ọ bụ ka bọzịrị Ede apụtaghị ịbịa rụọ ọrụ ya ka nna ya ukwu kụwara ya aka n’ụzọ.
Ka o mepeghi ụzọ, nna ya gbakazịrị ụzọ were hụ ozu ya ebe o yi mkpuchi ihu ma kpudo ihu n’àkwà.