AKỤKỌ ỤWA

MMADỤ IRI N’ASAA N’ỌNỊCHA EZUTELA ỌNWỤ HA KA ỤGBỌALA “HUMMER BUS” HA DABARA N’ỌWA MMIRI

Ọnịcha: Njinji jiri n’ụtụtụ ụbọchị Mọnde n’Ọnịcha, oge ụgbọala “Hummer Bus” bu mmadụ iri n’asatọ dagbunyere n’ọnwa mmiri (culvert) nke tojuru maka ide mmiri sitere n’oke mmiri zoro n’abalị ụka, bọtara ụbọchị ahụ.

Ihe mberede ahụ mere n’Upper Iweka, n’akụkụ ọ́dụ̀ ụgbọala na-aga Legọs tara isi mmadụ iri n’asaa, tinyere onye ọ̀kwọ́ ụgbọala, Mazị Josefụ Anene.

E bugazịrị sọọsọ ótù onye ahụ dị ndụ bụ nwunye onye ọ̀kwọ́ ụgbọala ahụ n’ụlọ ọ́gwụ̀ Borromeo. Nwanyị nọ na – eti mkpu ka a zọpụta di ya mana ọ maghị na di ya alawo mmụọ. Chai!

Ótù onye keke nọ ebe ahụ kwuru na ihe kpatara ihe mberede okporo ụzọ ahụ bụ ndị ọ̀kwọ́ ụgbọala ịgba oke ọsọ n’agbanyeghị na mmiri zochara.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close