MMADỤ ISE N’EDDA, EBONYI STEETI KA NDỊ BIASE, KRỌS RIVA STEETI GBURU MA TAA ANỤ HA EBE A NA-AZỌ ALA


Abakaliki: Mmadụ ise, ndị Ali Ugwele nọ n’Ekoli-Edda dị n’Okpuru Ọchịchị Ndịda Afikpo, Ebonyi Steeti abụrụla ndị e gburu ma taa anụ ha ebe ha na ndị Erei dị n’Okpuru Ọchịchị Biase, Krọs Riva Steeti na-azọ ala.
Ozi hoo!haa!! nwetara na – ekwu na a tara anụ mmad ise ahụ ndị a wakporo ka ha nọ na-abụta akpụ n’ugbo ha, iji kpuchie ogbugbu ha.
Kaosiladi, ótù onye, onye gbanahụrụ ndị mwakpo ahụ kọzịrị ihe mere.
Dọkịnta Eni Uduma Chima, Onyeisi Oche Okpuru Ọchịchị Ndịda Afikpo kwupụtara mwute ya maka ya bụ ọdachi.
Ọ sịrị: “N’ụbọchị Mọnde, abalị iri n’abụọ nke ọnwa Julaị, afọ 2021, ndi Egbor nọ n’Okpuru Ọchịchị Biase na Krọs Riva Steeti wakporo ndi be anyị ndị nọ n’ugbo ha n’Aliugwele, Ẹkọ̀lị̀ Edda.
“Ụfọdụ ndị ha gburu gụnyere Ama Chukwu, nwoke dị afọ iri atọ n’itolu, Mazi Egor Etta Oji na nwa ya nwoke, Feliks, onye dị afọ iri n’otu”
Kaodị ugbua, o nwebeghi ihe ndị Uwe Ojii n’Ebọnyi Steeti kwuru banyere okwu ahụ.