MMEMME

MMEMME AJỤ: N’AGBANYEGHỊ MMEPE OBODO NILE HON. OKECHUKWU WETAWORO, NDỊ UGBO JISIRI OMENALA HA IKE – EKWEREMADỤ

Enugwu: Sinetọ Ike Ekweremadụ, Sinetọ na anọchite anya mpaghara Ọdịda Anyanwụ Enugwu ma bụrụkwa onye jibukwa ọkwa dịka Osote Onyeisi Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Naịjiriya etoola ndị Ugbo n’Okpuru Ọchịchị Ọ̀gwụ̀ nke Enugwu Steeti maka etu ha si jisie omenala ha ike, n’agbanyeghị oke mmepe bataworo n’obodo ahụ.

N’okwu ya ụbọchị Satọdee na mmemme Àjụ́, Sinetọ Ike Ekweremadụ, onye jibu ọkwa dịka Osote Onyeisi Ụlọ Nzukọ Sineti Naịjiriya kelere ndị Úgbò maka etu ha si akwalite omenala ha. 

“Kemgbe afọ iri na abụọ, a na m abịa mmemme Àjụ́ nakwa mmemme ọbụla a na – eme n’Úgbò. N’ihi ya, a bụ m onye Úgbò. 

” A na ekelekwa nwa unu, Rt. Hon Toby Okechukwu maka mmepe puru iche o wetara n’obodo a. 

“N’agbanyeghị mmepe obodo nile ndi a, unu jisiri omenala unu ike”. 

N’okwu nke ya, Rt. Hon Toby Okechukwu, Onye Nnọchiteanya Mpaghara Ọ̀gwụ̀ /Oji Riva /Anịnri n’ụlọ Nzukọ Omebeiwu Nta Naịjiriya jara ụmụ okorobịa ndị ahụ sonyere na mmemme Àjụ́ ike maka ịkata obi were gosipụta na ha esila na ịbụ ụmụ okorobịa banye n’ọkwa ịbụ ụmụ nwoke tozuru etozu. 

“Unu bụ dimkpa! Unu egosiwo na unu etozuwo dịka nwoke. Ọ bụrụ oge gara aga, unu ka ọ dịzịrị ịna aga agha, iji chekwaa obodo anyị bụ Úgbò”

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close