MMEMME UGỤZỌ EMEKE NKE EMEKUKU


Owere: N’ọnwa Novemba afọ nile, ndị Emekuku nọ n’Okpuru Ọchịchị Mgbago Ugwu Owere n’Imo Steeti na – eme nnukwu mmemme bụ OGỤZỌ EMEKE.
Mmemme a na-egosi mmalite oge owuwe ihe ubi bụkwara na ncheta onye hiwere obodo ahụ aha ya bụ Ezelukwu.
A na-eji ike ọjị na Nkwọ Emeke, ebe ọgbakọ Emekuku nile amalite ya.
Mmemme nke afọ a malitere n’abalị iri n’asatọ nke ọnwa Nọvemba. A ga-eme ya izu ụka abụọ. Ọnụmara asatọ dị n’Emekuku ga-esonye na ịgụ egwu pụrụ iche e ji eme mmemme ahụ kwa abalị were ruo ụbọchị iri n’anọ.
Ụbọchị ahụ, ọnụmara ọbụla ga-ezukọ n’ọma ahịa ha maka mmemme ahụ.
Ọ gaa abalị anọ, ọdụdụ nwa Ezelukwu bụ Nkwọ Emeke na – eji íté ofe pụrụ iche a na-akpọ Para-Para eweta mmemme ahụ na njedebe. Ihe e ji esi ofe ahụ bụ azụ si na Mmiri Okitankwọ.
Ụbọchị ahụ kwa, ndị ụmụnna Amachara n’Azaraegbelu, ndị a maara dịka ndị Ezeji (ndị na-akọ ji nke ukwuu ) na – emezi Iriji iji pịachie mmemme ahụ.
Tupu Ezelukwu anwụọ, ọ kpọrọ ụmụ ya nile nnukwu oriri, ha nwekwara mkpebi ịna-eme oriri ahụ ebighị ebi iji nwee Ịdịnotu.
Ihe kacha apụta ìhè na Mmemme ahụ bụ Nkwupụta iwu mmemme ahụ nke na-esi n’aka Eze mmụọ nke Ugụzọ bụ Ọha Jịọjị Nnadi.
N’oge mmemme ahụ, udo pụrụ iche na-adị n’Emekuku. O nweghị onye ya na ibe ya ga-enwenwu esemokwu, ma fọdụzịa ịga nke ndị Uwe Ojii ma ọ bụ ụlọikpe.
Nke afọ a pụrụ iche, Hon. Filipu Ejiogu, onye Nnọchiteanya Mpaghara Mgbago Ugwu Owere n’Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Imo Steeti du ọtụtụ ndị òtù ya were bịa.