MMEMME

MMỌNWỤ IKENGA BỊARA BE ỌGADAGIDI ỤBỌCHỊ ISTA MỌNDE

Enugwu: Ụbọchị Ista Mọnde, abalị ise nke ọnwa Eprel afọ 2021, Mmọnwụ Ikenga bịara kpọtụrụ Ọgadagidi Ichie Pete Edochie na be ya n’Enugwu.

Nnukwu mmmadụ dị ka nnukwu arụsị. Ụbọchị ahụ, Ọgadagidi onye bụkwa Ọnọnenyi na Nteje kpọrọ ụfọdụ ndị enyi ya na ndị ọzọ ọnụ na-eru n’okwu ka ha soro nabata ndị mmọnwụ ahụ bịara ịkwanyere.

Ụfọdụ n’ime ha gụnyere; Dọkịnta Jo Nwaọgụ, Onye rịturu n’ọkwa dịka Odeakwụkwọ Ukwu Ọhanaeze Ndigbo, Ọchịagha J. Ọ. J. Okoloagụ, Akwa akwụrụ n’Ukehe, Ichie Fred Chukwuelobe, wdg.

N’Ala-Igbo, onye mmọnwụ chọ abịa n’obi ya bụ oke mmadụ. Ọgadagidi bụ oke mmadụ.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close