AKỤKỌ ỤWA
MMỌNWỤ Ọ̀KỤ́ZỤ̀ EJIRILA OBERE IHE GBANAHỤ IZUTE ỌNWỤ YA NA IHE MBEREDE ỌKADA



Ọnịcha – Ótù mmọnwụ Ọ̀kụ́zụ̀ ejirila obere ihe gbanahụ izute ọnwụ ya oge ọkada bu ya gwongworo bu simenti suru onwe ha na Njekọrịta Ụzọ Ọ̀kụ́zụ̀ ụbọchị Fraịdee.
Ozi si n’aka, Adeoye Irelewuyi, Onye Nlekọta Ụlọ ọrụ, Federal Road Safety Corps, Ngalaba Anambara Steeti, na-ekwu na ihe kpatara ya bụ ihe mberede bụ ibufe ibu oke. Ọkada ahụ bu ogologo mmọnwụ ahụ bụ izaga burukwa mmadụ abụọ ndị ótù ya ndị ọzọ.
Hmmm, unu na-egekwa? Ọ kwa mmọnwụ bụ mụọ? Mụọ a na-anwụ anwụ? Ya dịba.