NKE NA-EME UGBUA

MWAKPO GỌVANỌ ORTOM: E JIDELA NDỊ JUKUN ATỌ

Makurdi: Ndi Uwe Ojii anwuchikọọla mmadụ atọ ndị a na-enyo enyo maka mwakpo dị òjì égbè wakporo Gọvanọ Samụwel Ortom nke Benuwe Steeti ụbọchị Satọdee gara aga n’ugbo ya n’okporo ụzọ Makurdi – Gboko.

Onye ndụmọdụ Gọvanọ Ortom n’okwu nchekwa, Col. Paul Hemba, kwupụtara nkea ụbọchị Tuuzdee, oge ọ kpọ ndị nta akụkọ gagharịa n’ebe a nọrọ wakpo Ortom.

Hemba kọwara na ndị Uwe Ojii sịrị na ha nwetara ndị Jukun ndị ọ̀kụ̀ azụ mmadụ atọ ahụ n’akụkụ ebe ahụ a nọrọ chọọ ịgbagbu Gọvanọ Ortom.

Kaosiladi, ọ bụ ihe mgbagwoju anya na ndị Uwe Ojii jidere ndị Jukun ndị ọ̀kụ̀ azụ, ebe Gọvanọ Ortom na onwe ya kwuru na ndị wakporo ya bụ ndị nchị ehi.

Ụwa nile maara na Gọvanọ Ortom na ndị Miyetti Allah na ótù ndị Fulani ndị ọzọ “nọ n’agha” kemgbe ebe Ortom na-azọ ọdịmma ndị Steeti ya

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close