MWAKPO NDỊ ÒJÌÉGBÈ: NDI EZE ỌDỊNALA IMO STEETI AHAPỤWO ÒBÍ HA GBAA ỌSỌNDỤ



Owere: Ọtụtụ ndị eze ọdịnala n’Imo Steeti ahapụwo òbí ha gbaa ọsọndụ maka mwakpo ndị òjìégbè, ndị tọworo ma gbukwaa ndị òtù ha mmadụ ole na ole na nso a.
Ndị Eze ọdịnala e gbuworo na steeti ahụ ruru mmadụ ise ebe a tọkwaara ọtụtụ ndị ọzọ.
Mwakpo ndị eze ọdịnala na steeti ahụ n’ebe ọ kpụ ọkụ n’ọnụ malitere n’abalị asaa nke ọnwa Eprel afọ a, oge ndị òjìégbè tọọrọ Eze Chals Iroegbu nke Ụmụezie, Nguru, Aboh-Mbaise, ya na ndị Ichie ya. E mechara tọhapụ ha.
Eze E. Durueburuo nke Ọ̀kwụ́dọ̀ nakwa Eze Sampson Osunwa nke Ihebinowerre, n’Okpuru Ọchịchị Njaba zutere ọnwụ ha n’abalị iri na itoolu nke ọnwa Ọktoba afọ a, oge ndị òjìégbè wakporo ha ka ha na Onyeisi Oche Okpuru Ọchịchị ahụ nọ n’ọgbakọ.
Ótù ụbọchị ahụ, Eze Kenet Okereke nke Etekwuru dị n’Okpuru Ọchịchị Ọhaji-Egbema ji obere ihe gbalahụ ọnwụ mana ndị wakporo ya gbazịrị òbí ya na ụgbọala ya ọkụ.
N’abalị iri na itoolu nke ọnwa Nọvemba, a tọkwaara Eze Henrị Madụmere nke Achị Mbieri, n’Okpuru Ọchịchị Mbaitoli. E mechara hapụ kwa ya bụ eze ọdịnala,, onye nwa ya nwoke, Eze Madụmere bụbu Osote Gọvanọ Imo Steeti.
Ụbọchị Sọnde, abalị iri na abụọ nke ọnwa Disemba afọ a, a tọkwaara ndị Eze abụọ, Achọ Ndukwe na Pọl Ogbu ma gbakwaa òbí ha ọkụ.
E mechara gbapụta Ndukwe mana ihe e butezịrị bụ ózú Ogbu.
Ótù onye eze ọdịnala na steeti ahụ n’achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ọtụtụ n’ime ha agbaala ọsọndụ gbapụ n’òbí ha. Ọ sịkwa na ndụ ha dịzị Chineke n’aka.