AKỤKỌ ỤWA

NA NSỤKA, NWOKE EJIRILA AKA ÓDÒ KỤGBUO NNE NA NNA YA MAKA ỌGWỤ EGO

Nsụka: Njinji jiri n’obodo Aroji Mkporogwu, Iheakpu-Ọka Agụ dị n’Okpuru Ọchịchị Ndịda Igbo-Eze nke Enugwu Steeti ụbọchị Satọdee oge ótù nwoke Mazị Maịkị Ugwuanyị, onye dị afọ iri anọ n’isii jiri aka ódò kụgbuo nne na nna ya.

Nne ya laworo mmụọ, Oriakụ Flọrịnsị Ugwuanyị, ji aka ódò na – asụ ụtara tupu nwa ya nwoke awakpo ya, were aka ódò ahụ kụjaa ya isi.

O jji aka ódò ahụ pịasakwaa nna ya isi tupu ọ gazia kpọọ onye nọọsụ ọ gwara ka ọ bịa nye nne na nna ya ọgwụ, na áhụ̀ adịghị ha.

Nwanyị nọọsụ ahụ hụzịrị na nne na nna ya tọgbọrọ n’ózù, na o jirila aka ódò kụrichaa okpokoro isi ha. Ọ mịpụrụ gaa kpọọ ndị nche ógbè, ndị nyefeziri nwaamadị ahụ n’aka ndị Uwe Ojii.

Ihe a gbagwojuru ọhaneze anya. Kaosiladi, ótù nwanna ya, onye a chọghị ka a kpọọ aha ya kwuru ihe butere ya bụ ọdachi.

O kwuru na Maịkị chọrọ iji nne na nna ya gwọọ ọgwụ ego mana o metaghị ya mere o ji kpawazịa agwa ka onye isi mgbaka.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close