NKE NA-EME UGBUA

NAỊJIRIYA GA-AGBARI MA NDỊ NTOROBỊA IGBO MEKATA BULIE ÉGBÈ – SANUSI

Legọs: Alahaji Sanusi Lamido Sanusi, onye a chụụrụ n’ọkwa dịka Emịya nke Kano ekwuola hoo!haa!! na obodo Naịjiriya ga-agbari, ma ndị ntorobịa Igbo mekata bulie égbè ibuso Naịjiriya agha.

Nwoke a okwu ya na-ada ụda, onye jibukwa ọkwa dịka Gọvanọ Ụlọ akụ Etiti Naịjiriya (CBN) kwuru nkea n’ozi o tinyere n’ọba ozi mmekọrịta Facebook ya.

“Naịjiriya ga-agbari ma ndị ntorobịa Igbo bulie égbè n’iwe ịlụso obodo Naịjiriya ọgụ.

“Ka ọ dị taa, ọtụtụ ndị ntorobịa Igbo bụ ndị nkwado òtù IPOB.

“Ndigbo nọzuru akụkụ nile na Naịjiriya. Maka ya, ha jiri iwe buso obodo Naịjiriya agha, Naịjiriya ga-agbari”

Ndụmọdụ ya bụ ka e jiri mkparịta ụka na ịkpa udo were dozie okwu banyere ndị IPOB.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close