AKỤKỌ ỤWA

NAỊJIRIYA NA-EYIJA CNN EBE HA NA-EBITE EGO IJI KWỤ ỤGWỌ ỌNWA – RENO OMOKRI

Reno Omokri, ótù nwoke okwu ya na-ada ụda achịala Gọọmenti Naịjiriya ọchị maka ị́zọ̀ mba inye ụlọ mgbasa ozi CNN ntaramahụhụ maka ikwuputa ihe mere na Nkwafu Ọbara Leki n’abalị abụọ nke ọnwa Ọktoba afọ a.

Reno kwuru na Twitter sị, “Lai Mohammed chọrọ inye CNN ntaramahụhụ mana Gọọmenti ya nọzị n’elu ọnwụ. Ha na-ebute ego iji kwụọ ụgwọ ọnwa. Ha enweghị àgbà chaa chaa n’ọgbakọ mba ụwa. Ngwa ọgụ ha nile si mba ofesi. Nnwere onwe nke ha bụ sọọsọ n’ọnụ. Ha were na-azọ mba inye CNN ntaramahụhụ. O nweela ihe ha menwuru Boko Haram?

Cheta na Alahaji Lai Mohammed, Mịnịsta Naịjiriya na – ahụ maka Mgbasa ozi kwuru na Gọọmenti Naịjiriya ga-enye CNN, ụlọ mgbasa mba Amerịka ntaramahụhụ maka akụkọ ọgbụgba àmà o bùrù banyere Nkwafu Ọbara Leki.

Gọọmenti Etiti Naịjiriya ka na-ekwu na o nweghị ndị ọbụla ndị soja gbagburu na ngagharị iwe#EndSars na Leki n’ụbọchị ahụ.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close