AKỤKỌ ỤWA

NAỊJIRIYA NA – ACHỌ ITISA- NDỊ BISHỌỌPỤ ỤKA KATỌLIKI

Abụja: Ọgbakọ ndị Bishọọpụ Ụka Katọliki na Naịjiriya bụ Catholic Bishops’ Conference of Nigeria (CBCN) etiela mkpu maka ntisa nke ala Naịjiriya nọ n’elu ya site na ajọ ọnọdụ nchekwa na-arịzị ibe ya elu.

N’ozi nke Onyeisi ha, Achbishọọpụ Ọstịn Akụbụeze na Odeakwụkwọ ha, Bishọọpụ Kamilusu Umoh tinyere aka ụbọchị Tuuzdee n’Abụja, òtù a kwuru na ọ bụ sọọsọ amara Chineke mere na Naịjiriya etisabeghi.

Ndị Bishọọpụ ahụ kwara arịrị maka etu ajọ ọnọdụ nchekwa siri abawanye n’akụkụ Naịjiriya nile, karịa ibelata ebelata.

Ozi ahụ kọwara na ala Naịjiriya na-achọzị itisasị site n’ọgbaghara nakwa nkwafu ọbara jupụtara ebe nile dịka ndị Boko Haram na Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Mgbago Ugwu, ndị Ekperime ndị Fulani na Mpaghara Ọdịda Anyanwụ Mgbago Ugwu nakwa Obinetiti tinyekwara nsogbu ndị nchị ehi ndị Fulani.

Ha kpọrọ òkù ka Gọọmenti ka Gọọmenti mara ihe e mere tupu ọnọdụ enweghị nchekwa alaa obodo Naịjiriya n’iyi

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close