AKỤKỌ ỤWA

NANS AKATỌWO EFCC MAKA ỊKPỌCHI ỤMỤ AKWỤKWỌ MERE NGAGHARỊ IWE N’IHU ỤLỌ ỌRỤ HA

Abuja – Ótù jikọtara ụmụ akwụkwọ Naijiriya ọnụ bụ National Association of Nigerian Students, NANS, akatọwo etu ụlọ ọrụ na-emegide ngarị, Economic and Financial Crimes Commission, EFCC, siri kpụrụ ndi òtù ha ndi bịara ime ngagharị iwe n’ihu ụlọ ọrụ n’Ịbadan kpọchie.

Osote Onye Nlekọta ótù NANS na mpaghara Ọdịda anyanwụ Ndịda, Comrade Taiwo Owolewa, nọrọ n’ozi o zipuru ụbọchị Tọzdee, were kwuo na a kpọchiri ụfọdụ ndi ótù ha ji usoro udo eme ngagharị iwe n’ihu ụlọ ọrụ EFCC n’Ịbadan, na eme nta eme ímó.

Owolewa kọwara ihe ahụ ndi EFCC mere dị ka nke jọhburu udele sigbuo nkakwụ. O kwuru na o nweghị ihe ọjọọ ha mere ebe ọ bụ na “Ọ bụ ihe ziri ezi na ụmụ akwụkwọ ga-agbakọta were mee ngagharị iwe n’ụzọ udo, iji gosi iwe ha banyere ajọ ọnọdụ ọbụla megidere ha”

“Ebumnobi ajọ akparamagwa ha a bụ ikpuchi ụmụ amaala ọnụ, ka ha ghara ikwu okwu megide ajọ omume ndi n’ọkwa ọchịchị “

“Anyị na-akpọ oku ka EFCC hapụ ndi òtù anyị ha ji eji ozigbo. Anyị ga-agakwa n’ihu na ikwuputa uche obi anyị nakwa ịkatọ mmegbu sitere n’aka ndị ọchịchị ruo na anyị enweta ikpe nkwụmọtọ”

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close