MMEMME
NCHÈTÁ IGBO LANDING 2023: Ị́GỌ́ Ọ̀FỌ́ ỌKPARAEZE CHINEDUM ỌNỤỌHA NKE IBEKU NA DUNBAR CREEK, AMERIKA(IHE NKIRI)

https://youtube.com/shorts/bS5wkFIjqQ0?feature=share


N’abalị iri na abụọ nke ọnwa Ọgọọstụ afọ 2023 òtù Council for Igbo States in America (CISA) chịkọbara mmemme Ncheta Igbo Landing nke afọ a Dunbar Creek, Georgia na mba Ameríka.
N’oge ahụ, Chinedum Ọnụọha, Ọkparaeze Ibeku, n’Abịa Steeti jiri ọ́jị́ gọọ ọfọ iji rịọ Okuke Abịama, Chi Ndigbo maka ezumike mkpụrụobi ndị Igbo mmadụ iri asaa na ise ndị ahụ họọrọ ọnwụ karịa ịbụ óhù nyere ndị ọcha n’Amerịka.

Ọ rịọkwara ngọzi na nchekwa Obinigwe n’isi ụmụ Igbo nile, ma ọ́nọ́ n’ije ma ọ́nọ́ na mba.
Hmmmm, ekpere anyị bụ “Ọ̀ZỌ́ EMEZINA”