NDỊ AKPỤ OBI NWANNE GỌVANỌ ỤZỌDỊMMA ETIELA ONYE NTA AKỤKỌ GWOO GWOO


Owere: Nwanne Gọvanọ Hope Ụzọdịmma nke Imo Steeti, Uche Ụzọdịmma na ndị akpụ obi nọrọ ụbọchị Tuuzdee were tie Onye Nlekọta Akwụkwọ akụkọ Nigeria Watchdog, Comrade Precious Nwadike, gwoo gwoo maka akụkọ ọ na-ebu megidere Gọvanọ ahụ.
N’okwu n’ebe ọ nọ n’ụlọ ọgwụ anara ọgwụ, Nwadike kwuru na ọ bụrụ na ọ bụghị ndị mmadụ ndị gbatara ya ọsọ enyemaka, na ndị akpụ obi ahụ gara igbunyụ ya anya.
“A bịara m ime ndebanye aha NIN n’ụlọ ọrụ ndị NIMC dị n’Okporo Ụzọ Ígwéọ́chá, Owere. N’ihu ụlọ ọrụ ahụ, mmadụ suru aka n’ụgbọala m, gwa m lọghachi azụ. A lazịrị azụ, gaa kwụsị ụgbọala m n’ebe ọzọ.
“Oge ahụ ka ótù nwoke ndị Uwe Ojii na-esogharị jiri gwa na ọ bụ ya bụ onye ọrụ ngo ji ọrụ okporo ụzọ Ígwéọ́chá. A maghị m na ọ bụ Uche Ụzọdịmma, nwanne Gọvanọ Ụzọdịmma.
” Ọ malitere ịchị m ọchị na ihe m na-agba bụ nkanka ụgbọala. Ka rịturu na-abịazị ụlọ ọrụ ndị NIMC, ọ wakporo m tiwe m ihe. O dinyekwara ndị akpụ obi ya, ndi kụkwara m ka ha kụgbuo”