AKỤKỌ ỤWA
NDỊ DSS DỊ KA HA EGBUOLA KANỤ – IPOB


Ndi òtù Indigenous People of Biafra (IPOB) ekwuola na ọ dị ka ndị ụlọ ọrụ nchekwa Department of State Security (DSS) egbuola onyeisi IPOB bụ Mazi Nnamdi Kanu ebe ha akpọtanwughi ya n’ụlọ ikpe ụnyaahụ n’Abụja, etu a tụrụ anya.
N’ozi ya, Mazi Emma Powerful, Odeakwụkwọ Mgbasa ozi òtù ahụ kwuru sị: “Ọ dị ka ndị DSS egbuola onyeisi anyị, Mazi Nnamdi Kanu.

“Kemgbe ha tichara ya ihe, nyechaa udiri mmekpa ahụ dị iche iche, ha ekweghị enye dibịa oyibo ya ohere ileta ya.
“Obi erughizi anyị ala n’ọnọdụ a. Anyị mara ihe anyị ji etiri mkpu a. Anyị chọrọ ka ụwa mara na ihe ọbụla mere Mazi Nnamdi Kanu dị n’aka ndị DSS”