AKỤKỌ ỤWA

NDỊ FULANI AWAKPOWO MGBUJI, EHA-AMUFU, ENUGWU STEETI, GBUO MMADỤ IRI

Enugwu: Opekata ihe ruru mmadụ iri bụ ndị nwụnyụrụ anya oge ndị nchi ehi ndị Fulani wakporo ógbè ndị ọrụ ugbo ise na Mgbuji, Eha-Amufu dị n’Okpuru Ọchịchị Isi-Ụzọ n’Enugwu Steeti kemgbe abalị mbụ nke afọ a.

Ndị a ha gburu gụnyere ụmụaka na ụmụ nwanyị. Ozi hoo!haa!! nwetara na-ekwu na ha gbagbukwara ndị nche ógbè mmadụ atọ ka ha na-achụ ndị ntọ tọọrọ nwunye Dọkịnta Eugene Edeoga na nwa ya nwanyị n’abalị mbụ nke afọ a.

Dọkịnta Eugene Edeoga bụ nwanne Hon Chijioke Edeoga, Kọmishọna na-ahụ maka Gburugburu n’Enugwu Steeti.

Ihe karịrị mmadụ iri ise, ndi bi n’ógbè ndị ọrụ ugbo ndị ahụ agbaala ọsọ ndụ, kwara ihe ha gbaga n’ime obodo Mgbuji iji zee ndụ.

Ichie Eric Ebe, otu onye n’ime ndị sonwere obodo ahụ bụ otu onye n’ime ndị aha gbatara ọsọ ndụ n’ụlọ ya.

Ọ katọrọ ya bụ mwakpo ma kwukwaa na ndị be ha ahụsiela anya n’aka ndị nchi ehi ndị Fulani ahụ na-awakpo ha kwa mgbe kwa mgbe.

Ọ kọwara na ndị omekome ahụ wakporo obodo ha n’ebe elekere iri nke ụtụtụ ụbọchị ahụ.

Ebe kwakwara arịrị na ihe ha jiri malite afọ ọhụrụ bụ mwakpo ndị Fulani a nke taworo isi opekata mpe mmadụ iri kemgbe abalị mbụ nke afọ a.

Oge a kpọrọ Ọnụ na-ekwuru ndị Uwe Ojii n’Enugwu Steeti, Jude Ndukwe banyere okwu ahụ, ọ zaghị.

Ozi hoo!haa!! nwetakwara na-egosi na ndị mwakpo ahụ yi uwe ndị soja wakpokwara Mgbuji ụnyaahụ bụ Tọzdee.

Ka ọ dị ugbu a, ndị soja nọzị ebe ahụ iinyụ ndị omekome ahụ ịkpakwụ.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close