AKỤKỌ ỤWA
NDỊ NTỌ ÁTỌ́RỌ́WO NWOKE GWONGWORO KPỌ NWA YA AGA ỤLỌ Ọ́GWỤ̀


Ịlọrịn: Ndi ntọ atọ́rọ́wo Alhaji Musa Garba Atere, nwoke dị afọ iri anọ n’isii na-ányà ụgbọala gwongworo, ka ya na nwunye ya kpọ nwa ha nwanyị dị afọ asatọ nọ n’ọrịa agbaga ụlọ ọgwụ ụbọchị Tuuzdee n’okporo ụzọ Ogundele /Madi dị n’Ilorin, Kwara Steeti.
Nwunye nwoke ahụ kwuru sị, “Ndi Oji égbè dị mmadụ isii sịrị n’ọhịa mapụta kwụchie anyị ụzọ.
“Ha nakọrọ anyị ego nile anyị ji ma duru di m banye ime ọhịa,ka ọ nọ na-eti mkpu enyemaka”.
Ndi ntọ ahụ ziteere ya ozi na ego mgbapụta n’isi di ya bụ Nde Naira Iri atọ.
Ajayi Okasanmi, ọnụ na-ekwuru Ndị Uwe Ojii na Steeti ahụ kwuru na ha na – eme nnyocha banyere okwu ahụ.