AKỤKỌ ỤWA
NDỊ NTỌ AWAKPOLA MA TỌRỌ NWOKE ENUGWU BU OZU NWANNE YA ALỌTA MAKA ELIMOZU


Bini: Ndi ntọ yi uwe ndị Uwe Ojii nọrọ ụbọchị Satọdee n’ụzọ Bini “Byepass”, Edo Steeti were wakpo ma tọrọkwa nwoke si Legọs buru ozu nwanne ya aga Enugwu maka elimozu.
Ozi hoo!haa!! nwetara na-ekwu na ndị oji egbe ahụ malitere ịkwa mgbọ aghara aghara ozigbo ụgbọ bu ozu ahụ rutere nke onye ọ́kwọ́ ụgbọala so ha n’azụ nwụnyụrụ anya ka mgbọ tụrụ ya.
Ọnụ na-ekwuru Ndị Uwe Ojii na Steeti ahụ Nwauzor kwuru na ndị ótù ha ewelitewo ọnọdụ nchekwa n’okporo ụzọ ahụ.
E bugazịrị ozu nwoke ahụ n’ọba ozu dị na Bini ebe a na-agba mbọ ịgbapụta nwanne ya a tọ̀ọ̀rọ̀.
Kaosiladi, ndị ntọ ahụ ekwuola na ego mgbapụta nwaamadị ahụ ha tọ̀ọ̀rọ̀ bụ Nde Naira ise.
Nsogbu akarịa