NDỊ UWE OJII KANO ANWUCHIKỌỌLA NWOKE HISBAH N’ELU NWUNYE MMADỤ N’ỤLỌ NKWARI AKỤ


Kano: Ndi Uwe Ojii anwuchikọọla Sani Uba Rimo, onye so na ndị isi ndị Uwe Ojii Sharịya bụ Hisbah na Kano Steeti ka ya na nwunye mmadụ na-ákwá iko n’ụlọ nkwari akụ Downtown Hotel na Sabon Gari, Kano ụbọchị Mọnde.
A nwuchikọrọ nwoke ahụ site na mkpesa nke di nwanyị ahụ wegara ndị Uwe Ojii.
Kaọdịtaa, ndị Uwe Ojii ahapụwo ya mana Lawal Ibrahim, Ọnụ na-ekwuru Ndị Hisbah na Kano Steeti kwuru na ha ehiwela ótù Kọmitii nnyocha mmadụ ise ga-elebanye anya n’okwu ahụ.
Hmm, Leenụ ndị mere n’ihu gwọmpiti n’azụ, ndị okwu ọzọ eme ọzọ. Ọ kwa ndị Hisbah a bụ ndị na-eme mpụ dị iche iche na Kano, n’aha Sharịya.
Ha na-awakpo ọdụ nkwụ na ụlọ nkwari akụ, bukọrọ ma kụwasịa ekpem mmanya nile nọ ebe ahụ. Ha na-ejidekwa nwoke na nwanyị bịara ịgba oringo n’ọdụ nkwụ.
Nke ka nke bụ onye ọ́kpụ́ isi ha kpọchiri maka ịkpụ ndị mmadụ udiri isi megidere Sharịya.
Lezienụ ihe ha na-apịtọkọ