Uncategorized

NDAKPO NWATAKỊRỊ NWANYỊ: AKA AKPARALA ‘DADDY G.O. ABA

Aba – Aka ndị Uweojii Naijiriya Ngalaba Abịa Steeti akparala Peculiar Gịnịka, Onye Nlekọta {General Overseer(G.O.)/ Daddy G.O. nke ụlọ ụka Liberation Word Assembly International nọ n’Aba.

Ụlọ ụka ya nọ na Akara nke anọ n’Okporo ụzọ Egbula n’akụkụ Ụlọakụ Unity Bank didebere Okporo ụzọ Faulks n’Aba.

Nna ótù nwatakịrị nwagbọghọ, onye ezinụlọ ya na-abịa ụka ya wetara ndị Uweojii mkpesa etu ụkọchukwu arụrụala ahụ si adakpo ada ya nwanyị dị afọ Iri na asaa.

Ozi hoo!haa!! nwetara na-ekwu na nwatakịrị nwanyị sịrị na ụkọchukwu eteela o ji adakpo ya, kemgbe ọ dị afọ iri na ise.

Ndi Uweojii na-ekwukwa okwu ịkpụrụ nwanyị nọọsụ na-enye ụkọchukwu arụrụala ahụ ọ́gwụ̀ ite ime o ji emebi ụmụaka, onye nke mịrịkwara ọbàrà nwatakịrị nwanyị ahụ.

Hmmm, ndị ụkọchukwu Aba, gwanụ ndị òtù unu úkwù na-enwu ọkụ ka ha kwụsị imebi aha unu. Ọ dị ugboro ole?

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close