“NDEBANYE AHA NIN N’ETITI ỌRỊA KORO BỤ ARỤRỤALA, JỤNỤ YA” -HURIWA


Abụja: Ótù Human Rights Writers Association Nigeria, HURIWA, nọrọ ụbọchị Mọnde kpọọ òkù ka ụmụ amaala Naịjiriya jụ isonye na Ndebanye Aha NIN nakwa SIM kaadị na-aga n’ihu n’ala anyị ugbua, n’agbanyeghị na Ọrịa Koro na – asụ ndị mmadụ akwụ ugbua.
NN’ozi nke Onye Nlekọta Izugbe HURIWA, Mazị Ịmanụwel Dozie Ọnwụbiko tinyere aka, òtù ahụ kwuru sị, “Gọọmenti itinye atụmatụ ndebanye aha a Ọrịa Koro na – akpa mkpa mkpa ma jụ ibugharị ya bụ arụrụala nakwa idinye ụmụ amaala Naịjiriya igbu onwe ha
“Ebe Gọọmenti gosiri na mkpu ákwá ụmụ amaala Naịjiriya megide itinye atụmatụ a ugbua Ọrịa Koro kpụ ọkụ n’ọnụ, erughị ha ntị, anyị na – akpọku ụmụ amaala Naịjiriya, ma ụmụ nwanyị ma ndị Uwe Ojii, ka ha jụ isonye na ya bụ atụmatụ”
Òtù HURIWA kwukwara na ụfọdụ ndị esila na isonye na ya bụ atụmatụ ndebanye aha NIN bute Ọrịa Koro nke tara isi ha.
Chai! Nsogbu dị!