AKỤKỌ ỤWA

NDI AKWỤLA EMEWO NGAGHARỊ IWE MAKA ỤKỌ OKPU-NNABỤENYI

Ndi akwụla emeela ngagharị iwe maka ihi ụkọ okpu- nnabụenyi na mba Sawụtụ Afrịka.

Na ngagharị iwe ahụ nke ọ̀tù Bar Hostess chịkọbara, ndị akwụla ahụ kwuru na ihe kacha ewute ha bụ na ọrịa nsi nwanyị Gonorrhea kpụ ọkụ n’ọnụ na-arị ibe ya elu ugbu a na mba ahụ.

Ha kọwakwara na ya bụ ụkọ okpu-nnabụenyi, ngwa ọrụ dị oke mkpa n’ọrụ nke malitere kemgbe afọ gara aga na emebiri ha ihe.

N’okwu ya, ótù onye n’ime ha, Mercy kwuru sị, ” Ụkọ okpu-nnabụenyi a na-emebiri anyị ahịa.

“N’ihi ya, ọtụtụ ụmụ nwoke ndị ahịa anyị gadoziri nke ahụ aka were jụ ịzụta ya n’onwe ha ka anyị na ha were nwee mmekọahụ n’ejighi nchekwa ọbụla.

“Okpu-nnabụenyi bụ ihe nchekwa nyere anyị iji gbochi ibute ọrìa HIV/AIDS nakwa ọrịa Gonorrhea nke juru ebe nile ugbu a”.

Ndị ‘ọrụ obiọma’ ahụ rịọkwara ụmụ nwoke ndị na -abịakwute ha ka ha kwụsị ikwu okwu inwe mmekọahụ n’ejighi nchekwa ọbụla iji chekwaa ma onye ihu, ma onye azụ.

Hmmm, bikonu, ndị ọ dị n’aka, meenu ka ndị akwụla nweta ngwa ọrụ, ka udo were dị

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close