NDI DỌKỊNTA UNTH AKATỌWO MWAKPO, MMERU AHỤ HA NA-ENWETA N’AKA ỤMỤNNE NDỊ ỌRỊA

Enugwu: Òtù ndị Dọkịnta n’Ụlọ ọgwụ UNTH, Ituku – Ọzala, Enugwu Steeti bụ Association of Resident Doctors, ARD, akatọwo mwakpo na mmerụ ahụ ndị òtù ha na – enweta n’aka ụmụnne ndị ọrịa nọ n’ụlọ ọgwụ ahụ.
Ihe butere nkea bụ na nwanne onye ọrịa n’ụlọ ọgwụ ahụ nọrọ na nso nso a were wakpo onye Dọkịnta na-elekọta nwanne ya anya, were tie ya gwoo gwoo maka na ha enweghị afọ ojuju na etu o si elekọta nwanne ha nọ n’ọrịa anya.
N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ ka ha mechara ọgbakọ mberede, onyeisi oche ARD UNTH, Dọkịnta Jide Ụzọ ìgwè gbarụrụ ihu na ya bụ ajọ ọnọdụ sitere n’aka ụmụnne ndị ọrịa nọ n’ụlọ ọgwụ ahụ.
Ọ kọwara sị: “Anyị ehiwela òtù Kọmitii maka nchekwa nke Dọkịnta Ịmanụwel Ogbu bụ Onyeisi Oche ya.
“Ndị Uwe ojii nọkwa n’ọrụ ugbua iji nwụchikọrọ ya bụ onye omekome wakporo onye òtù anyị iji hụ na o nwetara ntaramahụhụ ziri ezi.”
Ọ dọkwara ọhaneze aka na ntị ka ha ghara iwakpo onye Dọkịnta ma ọ bụ onye ọrụ ahụike ọbụla kama ka ha nye mkpesa n’ụzọ kwesịrị ekwesị.
Dọkịnta Ụzọigwe kọwara na ndị nlekọta ụlọ ọgwụ ahụ ekwela nkwa ilebanye anya nke n’okwu banyere nchekwa site na itinyegasị ọkụ n’ebe ọkụ adịghị nakwa imezi ọnụ ụzọ ebe ndị Dọkịnta na anọ, ndi mebiri emebi.
Hmmm, nsogbu dị!