AKỤKỌ ỤWA

NDỊ EKPERIME EGBUOLA MMADỤ ASATỌ N’ỤLỌ ỤKA NDỊ ASSEMBLIES NA KADUNA

Kaduna: Ndị ekperime ndị Fulani nọrọ ụbọchị Wenzdee were wakpo ụlọ ụka ndị Assemblies of God dị na Ungwan Gaida, nke dịdebere Kurmin Kasa, n’Okpuru Ọchịchị Chikun, Kaduna Steeti.

Ha gbara ụlọ ụka ahụ ọkụ, gbukwaa mmadụ asatọ nọ ekpere oge ahụ.

Kọmishọna steeti ahụ na – ahụ maka nchekwa, Samụwel Aruwan, gwara gwara ndị nta akụkọ nkea.

Ọ sịrị na ndị tufuru ndụ ha na m wakpo ahụ gụnyere; Samaila Gajere, Bawa Gajere, Bitrus Baba, Umaru Baba, Solomon Samaila, Sambo Kasuwa, Samuila Kasuwa na Gideon Bitrus.

O kwukwara na Gọvanọ steeti ahụ, Mallam Nasir El Rufayị katọrọ mwakpo na ogbugbu ndị nọ n’ogige okpukpere chi dị iche iche na-efe Chineke.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close