AKỤKỌ ỤWA

NDỊ FULANI AWAKPOOLA BE GỌVANỌ ORTOM, GBUO MMADỤ ISE

Makurdi: Ndi nchị ehi Fulani nọrọ n’isi ụtụtụ ụbọchị ụka wakpo obodo Gọvanọ Benuwe Steeti, Samụwel Ortom bụ Tse-Apera, Nzorov dị n’Okpuru Ọchịchị Guma.

Ótù nwaamadị, onye obodo ahụ, Mazị Tseagba kwuru na ndị ahụ wakporo ha n’ebe elekere ise nke ụtụtụ.

“Ha na-asụ asụsụ Fulfude. Ha kụọrọ gị ike, i meghee ụzọ, ha a wakpo gị. A gbagburu mmadụ ise, bekwaa ótù onye isi.

“Mkpu ákwá ndị mmadụ bụ ihe kpọtere m. A gbakpuru m n’ime ọhịa, zoo onwe m”

Mazi Caleb Aba, Onyeisi Oche, Okpuru Ọchịchị Guma kwuru sị,

“Mmadụ asatọ ndị merụrụ ahụ ka e bugara ụlọ ọgwụ Teaching Hospital, Makurdi. Ha be kwara ótù onye isi”

Ọnụ na-ekwuru Ndị Uwe Ojii na saịtị ahụ, DSP Katriin Anene kwuru na “a wakporo ndị obodo ahụ n’isi ụtụtụ ụbọchị ụka mana amaghị m maka onye e bere isi”

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close