AKỤKỌ ỤWA

NDI GỌVANỌ MPAGHARA ỌWỤWA ANYANWỤ NDỊDA GA AHỤ BUHARI MAKA NTỌHAPỤ KANỤ-ỤMAHỊ

Abakiliki: Omenka Devid Ụmahị, Gọvanọ na – achị Ebọnyị Steeti ma bụrụkwa Onyeisi oche ọgbakọ ndị Gọvanọ Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ekwuola na ha ga-ahụ Onyeisiala Muhammadu Buhari, n’oge n’adịghị anya maka ịtọhapụ Mazi Nnamdi Kanụ, onyeisi òtù IPOB.

N’ozi nke o tinyere aka ụbọchị Tọzdee, Ụmahị kwuru na ha ga-eleba anya n’ụzọ a ga-eji gbasoo usoro ndọrọndọrọ ọchịchị iji dozie okwu ahụ.

Ụmahị kwukwara na ha ga-eleba anya banyere ọgbaghara na-arị ibe ya elu na mpaghara ahụ tinyekwara okwu ntimiwu Onye ọbụla Nọrọ be ya nke òtù dị iche iche iwu akwadoghi na-eti.

“Anyị na ụfọdụ ndị bụ Ọnụ na – ekwuru òtù ndị ahụ nọ na mkparịta ụka. Kaosiladị, anyị na ndị ọrụ nchekwa dị iche iche na-akpakwa maka nchekwa ndi be anyị”

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close